1. Samuel 14:13-31 Bible Nso (IGBOB)

13. Jonatan we bikwasi aka-ya na ukwu-ya rigo, onye nēbu ihe-agha-ya nēso kwa ya n'azu: ha we da n'iru Jonatan; onye nēbu ihe-agha-ya nēme kwa ka ha nwua n'azu ya.

14. Ntib͕u mbu ahu, nke Jonatan na onye nēbu ihe-agha-ya tib͕uru, we ra ka orú ndikom, n'ihe ra ka nkera furrow nke otù acre ala-ubi n'ọtùtù.

15. Ọma-jijiji we di n'ọmuma-ulo-ikwū, na n'ọhia, na n'etiti ndi ahu nile; ndi ebe-nguzo-ndi-agha na ndi-nbibi, ha onwe-ha ma-kwa-ra jijiji: ala de-kwa-ra ùdé; o we ghọ ọma-jijiji nke Chineke.

16. Ndi-nche Sọl nwere na Gibea Benjamin we hu; ma, le, ìgwè madu ahu b͕azere, we nēje iru na azu.

17. Sọl we si ndi ya na ha nọ, Biko, gukọtanu, hu onye siworo n'etiti ayi pua. Ha we gukọta, ma, le, Jonatan na onye nēbu ihe-agha-ya anọghi ya.

18. Sọl we si Ahaija, Bute ib͕e Chineke nso. N'ihi na ib͕e Chineke di n'etiti umu Israel n'ubọchi ahu.

19. O rue, mb͕e Sọl nāgwa onye-nchu-àjà ahu okwu, na ùzù nke di n'ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia we nāda kari, nāga n'iru nāba kwa uba: Sọl we si onye-nchu-àjà, Sepu aka-gi.

20. Sọl na ndi nile ya na ha nọ we kpọkọta onwe-ha, ba n'agha ahu: ma, le, mma-agha nwoke ọ bula digidere ibe-ya, oké ọb͕ub͕a-aghara uku we di.

21. Ma ndi-Hibru ndi diri ndi Filistia na mb͕e gara aga, ndi soro ha rigo n'ọmuma-ulo-ikwū buruburu, ndi ahu we chighari kwa idi n'akuku Israel ndi nọ n'aka Sọl na Jonatan.

22. Ndikom nile nke Israel ndi zoro onwe-ha n'ugwu Efraim we nu na ndi Filistia ab͕alagawo, ha onwe-ha we sogidesi kwa ha ike n'agha ahu.

23. Jehova we zọputa Israel n'ubọchi ahu: agha ahu we gabiga rue Bet-even.

24. Ma achiri ndikom Israel n'ihe-ike ubọchi ahu: Sọl we b͕a ndi Israel iyi, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēri nri rue anyasi, ru kwa mb͕e m'bọsiri ọ́bọ̀ n'aru ndi-irom. Ndi Israel nile we ghara idetu nri ọnu.

25. Ndi ala ahu nile we ba n'oké ọhia; ma manu-aṅu di n'elu ọhia.

26. Ndi Israel we ba n'oké ọhia ahu, ma, le, manu-aṅu nērù erù: ma ọ dighi onye kwere ka aka-ya rue ọnu-ya; n'ihi na ndi Israel turu egwu ọb͕ub͕a-iyi ahu.

27. Ma Jonatan anughi mb͕e nna-ya b͕ara ndi Israel iyi: o we setipu ọnu-ọnu nkpa-n'aka nke di n'aka-ya, rutu ya nime ub͕ub͕ọ-manu-aṅu, weghachi aka-ya n'ọnu-ya; anya-ya we nwue enwu.

28. Otù nwoke n'etiti ndi Israel we za, si, Nna-gi b͕asiri ndi Israel iyi ike, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēri nri ta. Ndi Israel we nāda #mbà.

29. Jonatan we si, Nnam emekpawo ala-ayi aru: biko, lenu na anyam enwuwo enwu, n'ihi na edetuwom nwantī manu-aṅu nka ire.

30. Ànya ndi Israel gēsi aṅa ghara inwukari enwu nke-uku, ma ọ buru na ha rijuru afọ ta site n'ihe-nkwata ndi-iro-ha nke ha hutara? n'ihi na ub͕u a ntib͕u n'etiti ndi Filistia abaghi uba.

31. Ha we tib͕ue ufọdu nime ndi Filistia n'ubọchi ahu site na Mikmash rue Ajalon: ndi Israel we da #mbà nke-uku.

1. Samuel 14