20. Samuel we me ka ebo Israel nile biarue nso, nzà we ma ebo Benjamin.
21. O we me ka ebo Benjamin biarue nso n'ab͕uru nile ha, nzà we ma ab͕uru Matri: nzà we ma Sọl nwa Kish: ha we chọ ya, ma achọtaghi ya.
22. Ha we ju kwa Jehova ase ọzọ, si, Ọ̀ kābiaghi ebe a, bú nwoke ahu? Jehova we si, Le, onye ahu ezowo onwe-ya n'etiti ihe.
23. Ha we b͕a ọsọ, si n'ebe ahu kuru ya; o we guzo onwe-ya n'etiti ndi Israel, ma ọ di ogologo kari onye ọ bula nime ndi Israel site n'ubu-ya we rue elu isi-ya.
24. Samuel we si ndi Israel nile, Ùnu ahuwo onye ahu nke Jehova rọputaworo, na ọ dighi onye di ka ya n'etiti ndi Israel nile? Ndi Israel nile we tie nkpu, si, Ka eze-ayi di ndu.