1. Samuel 10:12-17 Bible Nso (IGBOB)

12. Otù nwoke nke sitere n'ebe ahu we za, si, Ònye bu kwa nna-ha? N'ihi ya ọ ghọrọ ilu, bú okwu a, Sọl, ọ̀ di kwa n'etiti ndi-amuma?

13. O we bubìe amuma, bia rue ebe di elu ahu.

14. Nwa-nne nna Sọl we si ya na nwa-okorọbia-ya, Òle ebe unu jere? Ọ si, Ichọ nne-inyinya-ibu-ayi: ayi we hu na ọ dighi ebe ọ bula ha di, ayi we biakute Samuel.

15. Nwa-nne nna Sọl we si, Biko, gosim ihe Samuel siri unu.

16. Sọl we si nwa-nne nna-ya, O gosiri ayi nke-ọma na achọtawo nne-inyinya-ibu. Ma o gosighi ya okwu ala-eze ahu nke Samuel kwuru.

17. Samuel we kpọkọta ndi Israel ibiakute Jehova rue Mizpa;

1. Samuel 10