6. Onye-nkpab͕u-ya we kpasue ya iwe nke-uku, imekpa ya aru, n'ihi na Jehova mechiri àkpà-nwa-ya.
7. Ọ bu kwa otú a ka Elkena nēme kwa-arọ, mb͕e ọ bula Hana rigoro n'ulo Jehova, otú a ka Penina nākpasu ya iwe; o we kwa ákwá, ghara iri ihe.
8. Elkena, bú di-ya, we si ya, Hana, n'ìhi gini ka i nākwa ákwá? ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i nērighi ihe? ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka obi-gi jọrọ njọ? mù onwem adighi nma n'ebe i nọ kari umu-ndikom iri?
9. Hana we bilie mb͕e ha risiri ihe nime Shailo, mb͕e ha ṅusikwara ihe-ọṅuṅu. Ma Ilai, bú onye-nchu-àjà, nānọkwasi n'oche-ya n'akuku awara-uzọ ulo uku Jehova.
10. O we di Hana ilu na nkpuru-obi, o we kpere Jehova, kwasie ákwá ike.