13. Ma Hana, ya onwe-ya nēkwu okwu n'obi-ya; nání egbugbere-ọnu-ya nēme úkpọ̀rọ́, ma anughi olu-ya: Ilai we chè na ọ ṅubigara manya ókè.
14. Ilai we si ya, Rùe ole mb͕e ka i ganāṅubiga manya ókè? wezuga manya-vine-gi n'aru gi.
15. Hana we za, si, É-è, onye-nwem, nwayi nke mọ-ya di arọ́ ka m'bu: ọ dighi manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya m'ṅuworo, kama awusirim nkpuru-obim n'iru Jehova.
16. Agula orù-gi nwayi na nwayi jọb͕uru onwe-ya: n'ihi na ọ bu n'ọtutu ntughari-uchem na nkpasu-iwem ka m'siteworo kwue okwu rue ub͕u a.
17. Ilai we za, si, La n'udo: Chineke Israel nye kwa gi aririọ-gi nke i riọworo n'aka-Ya.
18. Hana we si, Ka nwayi nke nējere gi ozi huta amara n'iru gi. Nwayi ahu we je ije-ya, rie ihe, iru-ya ab͕arughi kwa n'ihi ya ọzọ.
19. Ha we bilie n'isi-ututu, kpọ isi ala n'iru Jehova, we lata, ba n'ulo-ha, rue Rema: Elkena we mara aru Hana nwunye-ya; Jehova we cheta ya.
20. O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na Hana turu ime, mua nwa-nwoke; o we kpọ aha-ya Samuel, si, N'ihi na ọ bu n'aka Jehova ka m'riọworo ya.
21. Nwoke ahu, bú Elkena, na ulo-ya nile we rigo ichuru Jehova aja arọ, na nkwa-ya.
22. Ma Hana arigoghi; n'ihi na ọ siri di-ya, rue mb͕e agēme ka nwata rapu ara, m'gēme kwa ka ọ bia, ka ewe hu ya anya n'iru Jehova, o we biri n'ebe ahu rue mb͕e ebighi-ebi.
23. Elkena, bú di-ya, we si ya, Me ihe di nma n'anya-gi; nọdu rue mb͕e i meworo ka ọ rapu ara; nání ka Jehova me ka okwu-Ya guzosie ike. Nwayi ahu we nọdu, nye nwa-ya ara, rue mb͕e o mere ka ọ rapu ara.
24. Ma mb͕e o mere ka ọ rapu ara, o we kuru ya n'aka-ya rigo, chiri kwa oke-ehi atọ, na otù ephah utu ọka, na otù karama-akpukpọ manya-vine, we me ka ọ ba n'ulo Jehova na Shailo: nwata ahu bu nání nwata.
25. Ha we b͕ue oke-ehi ahu, we me ka nwata ahu biakwute Ilai.
26. Hana we si, Biko, onyenwe m, nkpuru-obi-gi nādi ndu, onyenwe m, Mu onwem bu nwayi ahu nke guzoro onwe-ya nso gi n'ebe a, ikpere Jehova.
27. Ekpere bayere nwata nka ka m'kpere; Jehova we nyem aririọm nke m'riọrọ n'aka-Ya:
28. ọzọ kwa, mu onwem emewo ka ariọtara ya Jehova; ubọchi nile ọ nādi ndu ya onwe-ya bu onye ariọtaworo nye Jehova. Ilai we kpọ isi ala nye Jehova n'ebe ahu.