12. nēbinu obi-unu nke-ọma n'etiti ndi mba ọzọ; ka ha we site n'ọlu ọma nile unu, nke ha nēle anya, nye Chineke otuto n'ubọchi nleta ahu nime ihe ahu ha nēkwutọ unu nime ya dika ndi nēme ihe ọjọ.
13. Donu onwe-unu n'okpuru ibu-isi ọ bula madu debere n'ihi Onye-nwe-ayi; ma ọ bu eze, dika onye nọ n'ike n'elu unu;
14. ma-ọbu ndi-isi, dika ndi anēzite site n'aka-ya ka ha bọ̀ ọ́bọ̀ n'aru ndi nēme ihe ọjọ, ka ha to kwa ndi nēme ezi ihe.