1. Pita 2:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Ya mere, tupunu ihe ọjọ nile, na aghughọ nile, na iru-abua, na ekworo, na nkwutọ nile di iche iche,

2. dika umu amuru ọhu, ka agu miri-ara nke okwu Chineke, nke aghughọ nādighi ya, nāgusi unu ike, ka unu we were ya nētó etó rue nzọputa;

3. ọ buru na unu deturu n'ire na Onye-nwe-ayi bu onye nwere obi-ọma;

4. Onye unu nābiakute, bú nkume di ndu, Nke madu juru n'ezie, ma n'ebe Chineke nọ Ọ bu ihe arọputara, buru kwa ihe anāsọpuru,

5. ewe were kwa unu onwe-unu, dika nkume di ndu, wu, ka unu buru ulo nke Mọ Nsọ, ka unu we buru òtù ndi-nchu-àjà di nsọ, ichu àjà nke di ka Mọ Nsọ si cho, nke di Chineke ezi nma site na Jisus Kraist.

6. N'ihi na ekwuru n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, si,Le, anamatọb͕ọ na Zaion otù isi nkume nime nkuku ntọ-ala, nke bu ihe arọputara, buru kwa ihe anāsọpuru:Onye kwe-kwa-ra na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya ma-ọli.

7. Ya mere ọ bu unu, bú ndi kwere ekwe, ka nsọpuru ahu diri: ma n'ebe ndi nādighi-ekwe nọ,Nkume nke ndi nēwu ulo juru,Nke ahu ka emere isi nkuku ulo;

1. Pita 2