1. Ndi Tesalọnaika 3:7-11 Bible Nso (IGBOB)

7. n'ihi nka, umu-nna-ayi, akasiri ayi obi n'ihi unu nime nkpà-ayi nile na nkpab͕u-ayi nile site n'okwukwe-unu:

8. n'ihi na ayi di ndu ub͕u a, ọ buru na unu onwe-unu nēguzosi ike nime Onye-nwe-ayi.

9. N'ihi na ekele gini ka ayi puru inyeghachi Chineke bayere unu, n'ọṅù nile ayi ji ṅuria n'ihi unu n'iru Chineke-ayi;

10. abali na ehihie nāriọbiga aririọ ókè nke-uku ri nne ka ayi we hu iru-unu, dochi kwa ihe fọduru n'okwukwe-unu?

11. Ma ka Ya onwe-ya, bú Chineke-ayi na Nna-ayi, Onye-nwe-ayi Jisus, duzi uzọ-ayi rue ebe unu nọ:

1. Ndi Tesalọnaika 3