1. Ndi Tesalọnaika 2:15-20 Bible Nso (IGBOB)

15. ndi b͕uru Onye-nwe-ayi Jisus na ndi-amuma, chupu kwa ayi, ha bu kwa ndi ihe ha nēme nātọghi Chineke utọ, ha nēmegide kwa madu nile;

16. Na-eb͕ochi ayi igwa ndi mba ọzọ okwu ka ewe zọputa ha; imezu nmehie nile ha mb͕e nile: ma iwe Chineke abiakwasiwo ha rue ọgwugwu-ha.

17. Ma ayi onwe-ayi, umu-nna-ayi, ebe ekewapuru ayi n'aru-unu nwa oge ntà, n'iru, ọ bughi n'obi, ayi were oké agu nubiga ọku ókè n'obi kari ihu iru-unu:

18. n'ihi na ayi chọrọ ibiakute unu, mu onwem, bú Pọl, otù mb͕e na mb͕e ọzọ; Setan b͕ochikwara ayi.

19. N'ihi na gini bu olile-anya-ayi, ma-ọbu ọṅù-ayi, ma-ọbu okpu-eze nke inya-isi ayi? Ọ̀ bughi kwa unu onwe-unu, n'iru Onye-nwe-ayi Jisus n'ọbibia-Ya?

20. N'ihi na unu onwe-unu bu otuto-ayi na ọṅù-ayi.

1. Ndi Tesalọnaika 2