8. Ọ̀ gabu na anamekwu ihe ndia dika madu si ekwu? ma-ọbu ìwu Chineke adighi-ekwu kwa ihe ndia?
9. N'ihi na edewo ya n'iwu Moses, si, Ekechila ọnu ehi mb͕e ọ nāzọcha ọka. Ọ̀ gābu na ehi bu ihe nēmetu Chineke n'obi?
10. ma-ọbu Ò nēkwu ya n'ihi ayi onwe-ayi? E, n'ihi ayi ka edere ya n'akwukwọ nsọ: n'ihi na onye nālu ọlu ubi kwesiri ilu ọlu ubi n'olile-anya, onye nāzọcha ọka kwesiri kwa izọcha n'olile-anya na ọ gēketa.
11. Ọ buru na ayi onwe-ayi ghara ihe nke Mọ Nsọ dika nkpuru nye unu, ọ̀ bu ihe uku ma ọ buru na ayi onwe-ayi gēwere ihe nke anu-aru unu dika ihe-ubi?
12. Ọ buru na ndi ọzọ eketa ike a n'ebe unu nọ, àyi onwe-ayi adighi-eketa kari? Otú ọ di, ayi ejighi ike a nara ihe; kama ayi nānagide ihe nile, ka ayi we ghara ib͕ochi ozi ọma Kraist n'uzọ ọ bula.
13. Ùnu amataghi na ndi nālu ọlu n'ulo uku Chineke nēri ihe si n'ulo uku Chineke puta, na ndi nānọ kwa n'iru ebe-ichu-àjà nēso ebe ichu-àjà ahu nēkekọ ihe?