1. Ndi Kọrint 9:3-8 Bible Nso (IGBOB)

3. Ngọpum n'iru ndi nēkpem ikpé bu nka.

4. Ọ̀ gābu na ayi enweghi ike iri ihe na iṅu ihe?

5. Ọ̀ gābu na ayi enweghi ike ikuru nwunye, bú nwa-nna-nwanyi nime Kraist, jeghari, dika ndi-ozi fọduru nēme kwa, ha na umu-nne Onye-nwe-ayi, na Kifas?

6. Ma-ọbu nání mu onwem na Banabas, àyi enweghi ike ighara ilu ọlu?

7. Òle onye-agha nēwere ego-ọlu nke aka ya lua ọlu onye-agha mb͕e ọ bula? ònye nāku ubi-vine, nādighi-eri kwa nkpuru-ya? ma-ọbu ònye nāzù ìgwè aturu, nādighi-eri kwa ihe putara na miri-ara ìgwè aturu ahu?

8. Ọ̀ gabu na anamekwu ihe ndia dika madu si ekwu? ma-ọbu ìwu Chineke adighi-ekwu kwa ihe ndia?

1. Ndi Kọrint 9