1. Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti unu, ma asi na o nwere okwu megide ibe-ya, nwere anya-ike ije ikpé n'iru ndi ajọ omume, ma ọ bughi n'iru ndi nsọ?
2. Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi nsọ gēkpe uwa ikpé? ọ buru kwa na agaje ikpe uwa n'iru unu, ùnu ekwesighi inọ dika ndi-ikpé n'ulo-ikpé dikarisiri ntà?
3. Ùnu amataghi na ayi gēkpe ndi-mọ-ozi ikpé? àyi gēsi aṅa ghara inwe ike ikpe ihe nke ndu a?
4. Ya mere asi na unu nwere ulo-ikpé diri ndu a n'ezie, menu ka ndi ahu nọdu dika ndi-ikpé, bú ndi anākpọ ihe-efu n'etiti nzukọ Kraist.
5. Anamekwu nka ka m'me unu ihe-ihere n'iru. Ọ̀ di otú a, na ọ dighi otù onye mara ihe nọ n'etiti unu, onye gāpu ikpe ikpé n'etiti nwa-nna-ya na ibe-ya,