1. Ndi Kọrint 4:17-21 Bible Nso (IGBOB)

17. N'ihi nka ka m'zitere unu Timọti, onye bu nwam nime Onye-nwe-ayi, buru kwa onye m'huru n'anya, onye kwesiri ntukwasi-obi, ọ gēchetara unu uzọm nile nke di nime Kraist, dika m'nēzí n'ebe nile na nzukọ Kraist nile ọ bula.

18. Ma ufọdu fuliri onwe-ha elu, dika agāsi na m'gaghi-abiakute unu.

19. Ma m'gābiakute unu ọsọsọ, ma ọ buru na Onye-nwe-ayi chọrọ; m'gāmara kwa, ọ bughi okwu nke ndi fuliworo onwe-ha, kama ike-ha.

20. N'ihi na ala-eze Chineke adighi n'okwu-ọnu, kama n'ike.

21. Gini ka unu nāchọ? ọ̀ bu utari ka m'gēwere biakute unu, ma-ọbu ihu-n'anya na mọ nke idi-nwayọ?

1. Ndi Kọrint 4