1. Ndi Kọrint 15:15-19 Bible Nso (IGBOB)

15. Ọzọ kwa, anāhu na ayi bu ndi-àmà ugha nke Chineke; n'ihi na ayi b͕ara àmà megide Chineke na O mere ka Kraist ahu si n'ọnwu bilie; bú Onye Ọ nēmeghi ka O si n'ọnwu bilie, ma ọ buru na ọ bu ezie na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie.

16. N'ihi na asi na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie, emeghi kwa ka Kraist si n'ọnwu bilie:

17. ma ọ buru na emeghi ka Kraist si n'ọnwu bilie, okwukwe-unu bu ihe-efu; unu nānọ na nmehie nile unu ub͕u a.

18. Ya mere ndi da-kwa-ra n'ura ọnwu nime Kraist lara n'iyì.

19. Asi na ọ bu nání na ndu a ka ayi nweworo olile-anya-ayi nime Kraist, ayi bu ndi kwesiri ebere kari madu nile.

1. Ndi Kọrint 15