5. ọ dighi-eme ihe nādighi nma n'anya, ọ dighi-achọ ihe nke aka ya, oké iwe adighi-ewe ya, ọ dighi-agu ihe ọjọ emere ya;
6. ọ dighi-aṅuri ọṅu nime ajọ omume, ma ọ nēso ezi-okwu ṅurikọ ọṅu;
7. ọ nānagide ihe nile, nēkwere ihe nile, nēle anya ihe nile, nēnwe ntachi-obi n'ihe nile.
8. Ihu-n'anya adighi-ada mb͕e ọ bula: ma ọ buru na ibu-amuma di, agēme ka ha ghara idi irè; ọ buru kwa na asusu di iche iche di, ha gāgwu; ọ buru kwa na ihe-ọmuma di, agēme ka ọ ghara idi irè.
9. N'ihi na ayi mara na nkpirikpi, ayi nēbu kwa amuma na nkpirikpi:
10. ma mb͕e ọ bula ihe nke zuru okè gābia, agēme ihe, nke di na nkpirikpi ka ọ ghara idi irè.