1. Ndi Kọrint 12:18-26 Bible Nso (IGBOB)

18. Ma otú ọ di, Chineke debere ihe di n'aru, ha nile n'otù n'otù, nime aru, dika Ọ chọrọ.

19. Ma asi na ha nile bu otù ihe di n'aru, òle ebe ka aru di?

20. Ma otú ọ di, ha di ọtutu ihe di n'aru, ma ha bu otù aru.

21. Ọzọ, anya apughi isi aka, Nkpà gi akpaghi m: ọzọ kwa, isi apughi isi ukwu, Nkpà unu akpaghm.

22. Kama ọ bu ihe ahu di n'aru nke anēchè na ha adighi ike kari bu ihe di nkpà kari nke-uku:

23. akuku ahu nke aru, nke ayi nēchè na adighi-asọpuru ha dika akuku ọzọ, akuku ndia ka ayi nēnyebiga kwa nsọpuru ókè kari; akuku aru nke ayi nke nādighi kwa nma n'anya bu nke mabigara ókè kari;

24. ma nkpà akpaghi akuku aru nke ayi nke mara nma: kama Chineke tigwara aru n'otù, akuku aru ahu nke nsọpuru fọduru ya inwe ka Ọ nēnyebiga nsọpuru ókè kari;

25. ka nkewa we ghara idi n'aru; kama ka ihe di n'aru we nēcheb͕u onwe-ha nye ibe-ha n'otù uzọ ahu.

26. Ọ buru kwa na otù ihe nke di n'aru nāhu ahuhu, ihe nile di n'aru ahu soro ya nāhukọ ahuhu; ọ buru kwa na anēnye otù ihe di n'aru otuto, ihe nile di n'aru ahu soro ya ṅurikọ ọṅu.

1. Ndi Kọrint 12