1. Ndi Kọrint 11:6-10 Bible Nso (IGBOB)

6. N'ihi na asi na nwanyi ekpudoghi onwe-ya ihe n'isi, ka akpacha kwa agiri-isi-ya: ma asi na ọ buru nwanyi ihe-ihere ka akpacha agiri-isi-ya ma-ọbu ka akọpu isi-ya, ka ekpudo ya ihe n'isi.

7. N'ihi na nwoke ekwesighi n'ezie ka ekpudo ya ihe n'isi, ebe ọ bu onyinyo na otuto nke Chineke: ma nwanyi bu otuto nke nwoke.

8. N'ihi na nwoke esighi na nwanyi puta; kama nwanyi siri na nwoke puta:

9. n'ihi na ekèghi kwa nwoke n'ihi nwanyi; kama ekère nwanyi n'ihi nwoke:

10. n'ihi nka ka nwanyi kwesiri ikpu ihe-iriba-ama nke ike n'isi-ya, n'ihi ndi-mọ-ozi.

1. Ndi Kọrint 11