6. N'ihi na asi na nwanyi ekpudoghi onwe-ya ihe n'isi, ka akpacha kwa agiri-isi-ya: ma asi na ọ buru nwanyi ihe-ihere ka akpacha agiri-isi-ya ma-ọbu ka akọpu isi-ya, ka ekpudo ya ihe n'isi.
7. N'ihi na nwoke ekwesighi n'ezie ka ekpudo ya ihe n'isi, ebe ọ bu onyinyo na otuto nke Chineke: ma nwanyi bu otuto nke nwoke.
8. N'ihi na nwoke esighi na nwanyi puta; kama nwanyi siri na nwoke puta:
9. n'ihi na ekèghi kwa nwoke n'ihi nwanyi; kama ekère nwanyi n'ihi nwoke:
10. n'ihi nka ka nwanyi kwesiri ikpu ihe-iriba-ama nke ike n'isi-ya, n'ihi ndi-mọ-ozi.