1. Ndi Kọrint 10:22-30 Bible Nso (IGBOB)

22. Ma-ọbu àyi nākpasu Onye-nwe-ayi ekworo? àyi ka Ya ike?

23. Ihe nile ziri ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile bara urù. Ihe nile ziri ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile nēwuli madu elu dika ulo.

24. Ka onye ọ bula ghara ichọ ọdi-nma nke aka ya, kama ọdi-nma nke madu-ibe-ya.

25. Ihe nile ọ bula anēre n'ahia anu, rienu ya, ghara iju ajuju n'ihi akọ-na-uche;

26. n'ihi na uwa bu nke Onye-nwe-ayi, na ùjú-ya.

27. Ọ buru na onye ọ bula n'etiti ndi nēkweghi akpọ unu n'oriri, ọ buru kwa na unu achọ ije; ihe ọ bula anēdebe n'iru unu, rienu ya, ghara iju ajuju n'ihi akọ-na-uche.

28. Ma ọ buru na onye ọ bula asi unu, Achuru ihe a n'àjà, unu erila, n'ihi onye ahu nke gosiri ya, na n'ihi akọ-na-uche:

29. akọ-na-uche, ka m'kwuru, ọ bughi nke aka gi, kama akọ-na-uche nke madu-ibe-gi; n'ihi na gini mere akọ-na-uche ọzọ nēkpe inwe-onwem ikpé?

30. Ọ buru na mu onwem ji ekele keta, gini mere anēkwulum n'ihi ihe ahu nke mu onwem nēkelere ekele?

1. Ndi Kọrint 10