22. Solomon we guzo n'iru ebe-ichu-àjà Jehova n'iru nkpọkọta nile nke Israel, we b͕asa ọbu-aka-ya abua n'ebe elu-igwe di:
23. ọ si, Jehova, bú Chineke Israel, ọ dighi Chineke dika Gi, n'elu-igwe di n'elu, ma-ọbu n'elu uwa di n'okpuru; I nēdebere ndi-orù-Gi ọb͕ub͕a-ndu na ebere, bú ndi were obi-ha nile nējeghari n'iru Gi:
24. I debeworo orù-Gi Devid, bú nnam, ihe I gwara ya: I we were ọnu-Gi kwue, were kwa aka-Gi mezue ya, otú ọ di ta.
25. Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, debere orù-Gi Devid, bú nnam, okwu nke I gwaworo ya, si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n'irum n'inọkwasi n'oche-eze Israel; nání ọ buru na umu-gi elezi uzọ-ha anya, ijeghari n'irum dika i jeghariworo n'irum.
26. Ma ub͕u a, Chineke Israel, biko, ka okwu-Gi kwesi ntukwasi-obi, nke I gwara orù-Gi, bú Devid nnam.