1. Ndi-Eze 7:41-47 Bible Nso (IGBOB)

41. ogidi abua ahu, na ọkwa abua nke isi nke di n'elu ogidi abua; na ihe-ọkpukpa abua ahu ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n'elu ogidi;

42. na nnù pomegranate ahu nke diri ihe-ọkpukpa abua ahu; bú akuku pomegranate abua bayere otù ihe-ọkpukpa, ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n'iru ogidi;

43. na ihe-ndọkwasi iri ahu, na ite ọsisa-miri iri ahu nke di n'elu ihe-ndọkwasi;

44. na otù oké osimiri ahu, na ehi iri na abua ahu nke di n'okpuru oké osimiri;

45. na ite nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile: ma ihe ndia nile, nke Hairam mere eze, bú Solomon, n'ulo Jehova, bu ọla nēb͕u maramara.

46. Na buruburu-ala Jọdan ka eze wuru ha, n'ala urọ n'etiti Sukot na Zaretan.

47. Solomon we dọba ihe ahu nile ghara itù ha, n'ihi na ha bara uba nke ukwu: achọputaghi ọtùtù ọla ahu.

1. Ndi-Eze 7