1. Ndi-Eze 5:12-14 Bible Nso (IGBOB)

12. Jehova nye-kwa-ra Solomon amam-ihe, dika Ọ gwara ya; udo we di n'etiti Hairam na Solomon; ha abua we b͕a ndu.

13. Eze, bú Solomon, we weputa usu ndi nēfè òfùfè n'Israel nile; usu ahu ndi nēfè òfùfè bu orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù iri-na-ise.

14. O ziga ha na Lebanon, orú nnù ndikom na nnù ise n'ọnwa na nb͕anwe: otù ọnwa ka ha nọ na Lebanon, ọnwa abua n'ulo: Adonairam bu kwa onye-isi usu ndi nēfè òfùfè.

1. Ndi-Eze 5