1. Ndi-Eze 5:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Hairam, bú eze Taia, we zìe ndi-orù-ya jekuru Solomon: n'ihi na ọ nuru na ya ka ha tere manu ibu eze n'ọnọdu nna-ya: n'ihi na onye nāhu Devid n'anya ubọchi nile ka Hairam bu.

2. Solomon we zigara Hairam ozi, si,

3. Gi onwe gi amawo Devid, bú nnam, na ọ pughi iwuru aha Jehova, bú Chineke-ya, ulo n'ihi agha nke b͕ara ya buruburu, rue mb͕e Jehova tiyere ha n'okpuru ọbu-ukwu-ya abua.

4. Ma ub͕u a Jehova, bú Chinekem, emewo ka m'zuru ike buruburu; ọ dighi onye-nmegide, ọ dighi kwa ihe ọjọ daputara ayi.

1. Ndi-Eze 5