5. Azaraia nwa Netan bu onye-isi nke ndi edoro ndi-isi; Zabud nwa Netan bu onye-isi n'ije ozi na eyì eze;
6. Ahisha bu onye-isi ulo eze; Adonairam nwa Abda bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè.
7. Solomon nwe-kwa-ra ndikom iri na abua edoro ndi-isi Israel nile, ndi nāzù eze na ulo-ya: nwoke ọ bula nime ha nwe izù eze otù ọnwa n'arọ.
8. Ndia bu kwa aha-ha: Ben-hua, n'ugwu Efraim:
9. Ben-deka, nime Makaz, na nime Shaalbim na Bet-shemesh, na Ilon-bet-hanan:
10. Ben-hesed, n'Arubot; ya nwere Soko na ala Hefa nile:
11. Ben-abinadab, n'ebe nile di elu nke Doa; Tafat nwa Solomon ka ọ nwere na nwunye:
12. Beana nwa Ahailud, nime Teanak na Megido, na Bet-shean nile nke di n'akuku Zaretan, n'okpuru Jezreel, site na Bet-shean rue Ebel-mehola, rue ofè Jọkmeam: