1. Ndi-Eze 2:30-32 Bible Nso (IGBOB)

30. Benaia we biarue Ulo-ikwū Jehova, si ya, Otú a ka eze siri, Puta. Ọ si, É-è; kama n'ebe a ka m'gānwu. Benaia we weghachiri eze okwu, si, Otú a ka Joab kwuru, ọ bu kwa otú a ka ọ zaram.

31. Eze we si ya, Me dika o kwuworo, dakwasi ya, lì kwa ya; ka i we si n'ebe m'nọ na n'ebe ulo nnam nọ wezuga ọbara awusiri n'efu, nke Joab wusiri.

32. Jehova gēme kwa ka ọbara-ya laghachi n'isi-ya, n'ihi na ọ dakwasiri ndikom abua bu ndi ezi omume na ndi di nma kari ya, o were mma-agha b͕ue ha, ma nnam, bú Devid, amaghi ya, bú Abnea nwa Nea, onye-isi usu-ndi-agha Israel, na Amasa nwa Jeta, onye-isi usu-ndi-agha Juda.

1. Ndi-Eze 2