1. Ndi-Eze 18:15-33 Bible Nso (IGBOB)

15. Elaija we si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, n'ezie ta ka m'gēme ka ọ hum anya.

16. Obadaia we je izute Ehab, gosi ya: Ehab we je izute Elaija.

17. O rue, mb͕e Ehab huru Elaija, na Ehab siri ya, Ọ̀ bu gi bu nka, gi onye nēmekpa Israel aru?

18. Ọ si, Emekpaghm Israel aru; kama ọ bu gi onwe-gi, na ulo nna-gi, nime nrapu unu rapuworo ihe nile Jehova nyere n'iwu, i we jeso Bealim.

19. Ma ub͕u a ziga, chikọtaram Israel nile rue ugwu Kamel, na ndi-amuma Beal, ndi di nnù madu na ọgu abua na iri, na ndi-amuma Ashera, ndi di nnù madu, ndi nēri ihe na table Jezebel.

20. Ehab we zisa ozi n'etiti umu Israel nile, chikọta ndi-amuma ahu rue ugwu Kamel.

21. Elaija we biarue ndi Israel nile nso, si, Rùe ole mb͕e ka unu onwe-unu ganārughari n'etiti uzọ abua ndia? ọ buru na Jehova bu Chineke, jesonu Ya: ọ buru Beal, jesonu ya. Ma ndi Israel azaghi ya okwu ọ bula.

22. Elaija we si ndi Israel, Mu onwem, abum onye-amuma Jehova fọduru, náním; ma ndi-amuma Beal di nnù ndikom na ọgu abua na iri.

23. Ka ha nye kwa ayi oke-ehi abua; ka ha rọputa-kwa-ra onwe-ha otù oke-ehi, bọ ya n'ọbubọ-ya, tukwasi ya n'elu nkú, ma ka ha ghara itiye ọku: mu onwem gēdozi kwa oke-ehi nke-ọzọ, tiye n'elu nkú, ma m'gaghi-etiye ọku.

24. Unu gākpọku kwa aha chi-unu, ma mu onwem gākpọku aha Jehova: ọ gēru kwa, na chi ahu nke nēwere ọku za, onye ahu bu Chineke. Ndi Israel nile we za, si, Ọ di nma, bú okwu a.

25. Elaija we si ndi-amuma Beal, Rọputaranu onwe-unu otù oke-ehi, buru uzọ dozie ya; n'ihi na unu onwe-unu di ọtutu; kpọku-kwa-nu aha chi-unu, ma unu etiyela ọku.

26. Ha we were oke-ehi nke enyere ha, ha we dozie ya, kpọkue aha Beal site n'ututu we rue etiti-ehihie, si, Beal, za ayi. Ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa onye nāza. Ha we wukwasi n'elu ebe-ichu-àjà nke emere.

27. O rue, n'etiti-ehihie, na Elaija kwara ha emò, si, Werenu oké olu kpọ: n'ihi na chi ka ọ bu; n'ihi na ọ nātughari uche-ya, ma-ọbu na o wezugawo onwe-ya, ma-ọbu na ọ nọ n'ije, ma-ọbu eleghi anya ya onwe-ya nāraru ura, ma ọ gēteta.

28. Ha we were oké olu kpọ, were mma-agha na ube bìe aru onwe-ha dika ha si eme, rue mb͕e ọbara wukwasiri ha.

29. O rue, mb͕e etiti-ehihie gasiri, na ha nēbu amuma rue mb͕e nsure onyinye-inata-iru-ọma; ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa onye nāza, ọ dighi kwa ọṅuṅa-nti di.

30. Elaija we si ndi Israel nile, Biaruenu nsom; ndi Israel nile we biarue ya nso. O dozie ebe-ichu-àjà Jehova nke etipiara.

31. Elaija we chiri nkume iri na abua, dika ọnu-ọgugu ebo umu Jekob si di, bú onye okwu Jehova ruru nti, si, Israel gābu aha-gi.

32. Ọ chiri nkume ahu wue ebe-ichu-àjà n'aha Jehova; ọ me ebe miri gādọrọ, ra ka ebe gānagide mb͕é nkpuru-ọghigha abua, buruburu ebe-ichu-àjà.

33. O do nkú n'usoro, bọ oke-ehi-ya n'ọbubọ-ya, tukwasi ya n'elu nkú. Ọ si, B͕ajuenu okpokoro anọ miri, wukwasi ya n'elu àjà-nsure-ọku, na n'elu nkú.

1. Ndi-Eze 18