1. Okwu Jehova we rue Jihu, bú nwa Hanani, nti, imegide Beasha, si,
2. N'ihi na esim n'ájá welie gi elu, me gi onye-ndú ndim, bú Israel; i we je ije n'uzọ Jeroboam, me ndim, bú Israel, ka ha mehie, iwere nmehie nile ha kpasuem iwe;
3. le, M'nēkpochapu nke fọduru nke Beasha, bú nke fọduru nke ulo-ya; M'gēme kwa ulo-gi ka ọ di ka ulo Jeroboam, bú nwa Nebat.
4. Onye nke Beasha nke nwuru anwu n'obodo, nkita gēri ya; onye nke ya nke nwuru anwu n'ọhia, anu-ufe nke elu-igwe gēri kwa ya.
5. Ma okwu Beasha nile nke fọduru, na ihe o mere, na idi-ike-ya, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?
6. Beasha we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya na Tiaza; Ila, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.