1. Ndi-Eze 13:29-32 Bible Nso (IGBOB)

29. Onye-amuma ahu we bulie ozu onye nke Chineke ahu, dọba ya n'elu inyinya-ibu ahu, bughachi ya: ọ biarue obodo onye-amuma ahu, bú agadi, iti aka n'obi, na ilì ya.

30. Ọ dọba ozu-ya n'ílì-ya; ha we tiere ya aka n'obi, si, Ewó, nwa-nnem!

31. O rue, mb͕e o lìsiri ya na ọ gwara umu-ya okwu, si, Mb͕e m'nwuru, lì-kwa-num n'ílì nke elìri onye nke Chineke; dọba ọkpukpum n'akuku ọkpukpu-ya.

32. N'ihi na okwu ahu aghaghi irè, bú nke ọ kpọrọ òkù n'okwu Jehova megide ebe-ichu-àjà nke di na Bet-el, megide kwa ulo nile nke ebe di elu nke di n'obodo nile nke Sameria.

1. Ndi-Eze 13