1. Ndi-Eze 13:17-25 Bible Nso (IGBOB)

17. n'ihi na okwu rurum nti n'okwu Jehova, si, Erila nri, aṅu-kwa-la miri, n'ebe ahu, alaghachi-kwa-la ila n'uzọ ahu i jere nime ya.

18. Ọ si ya, Mu onwem bu kwa onye-amuma dika gi; mọ-ozi we gwam okwu n'okwu Jehova, si, Me ka o soro gi lata n'ulo-gi, ka o we rie nri ṅu kwa miri. Ma ọ gwara ya okwu-ugha.

19. O we soro ya laghachi, rie nri n'ulo-ya, ṅu kwa miri.

20. O rue, mb͕e ha abua nānọdu nēri ihe na table, na okwu Jehova ruru onye-amuma ahu nti, bú onye mere ka ọ laghachi:

21. ọ kpọ onye nke Chineke ahu òkù, bú onye siri na Juda bia, si, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na i nupuwo isi n'okwu-ọnu Jehova, i we ghara idebe ihe enyere n'iwu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi n'iwu,

22. i we laghachi, rie nri, ṅua miri, n'ebe nke Ọ gwara gi okwu, si, Erila nri, aṅu-kwa-la miri; ozu-gi agaghi-abiaru ílì nna-gi-hà.

23. O rue, mb͕e o risiri nri, mb͕e ọ ṅusi-kwa-ra ihe-ọṅuṅu, na o were inyinya-ibu jikwara ya, bú onye-amuma ahu nke o mere ka ọ laghachi.

24. Ọ we la, ọdum we huta ya n'uzọ, me ka ọ nwua: ewe tupu ozu-ya n'uzọ, inyinya-ibu-ya nēguzo kwa n'akuku ya; ọdum ahu nēguzo kwa n'akuku ozu ahu.

25. Ma, le, ndikom nāgabiga, ha we hu ozu, ka atupuru ya n'uzọ, hu kwa ọdum, ka o nēguzo n'akuku ozu ahu: ha we bia, kwue ya n'obodo nke onye-amuma ahu, bú agadi, nēbi nime ya.

1. Ndi-Eze 13