43. Jonatan we za, si Adonaija, N'ezie onye-nwe-ayi, bú eze Devid, emewo Solomon eze:
44. eze we ziga Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, na Benaia nwa Jehoiada, na ndi Keret na ndi Pelet, tiyere ya, ha emewo kwa ka ọ nọkwasi inyinya mule eze nwere:
45. Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, etewo kwa ya manu ibu eze na Gaihon: ha esiwo kwa n'ebe ahu rigo nāṅuri ọṅu, obodo we b͕a aghara. Nka bu olu unu nuworo,