1. Ihe Emere 9:4-9 Bible Nso (IGBOB)

4. Utai nwa Amihud, nwa Ọmri, nwa Imri, nwa Bani, onye sitere n'umu Perez nwa Juda.

5. Ndi sitere na ndi Shailo; Asaia, bú ọkpara, na umu-ya ndikom.

6. Ndi sitere n'umu Zera; Jeuel, na umu-nne-ha, nnù madu na ọgu iri-na-anọ na iri.

7. Ndi sitere n'umu Benjamin; Salu nwa Meshulam, nwa Hodavaia, nwa Hasenua;

8. na Ibneia nwa Jeroham, na Ila nwa Uzi, nwa Mikri, na Meshulam nwa Shefataia, nwa Reuel, nwa Ibnija;

9. na umu-nne-ha, dika osuso-ọmumu nile ha si di, nnù madu abua na ọgu asa na iri na isi. Ndikom ndia nile bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna diri ulo nke ndi bu nna-ha.

1. Ihe Emere 9