35. Ma nime Gibeon ka nna Gibeon biri, bú Jeiel, aha nwunye-ya bu Meaka:
36. na nwa-ya, bú ọkpara, bú Abdon, na Zua, na Kish, na Beal, na Nea, na Nedab;
37. na Gedoa, na Ahio, na Zekaraia, na Miklot.
38. Miklot we mua Shimeam. Ha onwe-ha we so kwa umu-nne-ha biri na Jerusalem, na ncherita-iru umu-nne-ha.
39. Nea we mua Kish; Kish mua Sọl; Sọl mua Jonatan, na Malki-shua, na Abinadab, na Eshbeal.
40. Nwa-nwoke Jonatan bu Merib-beal; Merib-beal we mua Maika.
41. Umu-ndikom Maika kwa; Piton, na Melek, na Tahrea, na Ehaz.