35. Umu-ndikom Maika kwa; Piton, na Melek, na Tarea, na Ehaz.
36. Ehaz we mua Jehoada; Jehoada we mua Alemet, na Azmavet, na Zimri; Zimri we mua Moza:
37. Moza mua Binea; Rafa bu nwa-ya, Eleasa nwa-ya, Azel nwa-ya:
38. Azel nwere umu-ndikom isi, ndia bu kwa aha-ha; Azrikam, na Bokeru, na Ishmael, na Shearia, na Obadaia, na Henan. Ndia nile bu umu-ndikom Azel.
39. Umu-ndikom Ishek nwa-nne-ya nwoke kwa; Ulam, bú ọkpara-ya, na Jeush, bú nke-abua, na Elifelet, bú nke-atọ.