12. Shupim kwa, na Hupim, bú umu Ia, na Hushim, bú umu Ahea.
13. Umu-ndikom Naftali; Jahaziel, na Guni, na Jiza, na Shalum, bú umu Bilha.
14. Umu-ndikom Manase; Asriel, onye nwunye-ya muru: (iko-ya nwayi, bú nwayi Eram, muru Makia nna Gilead:
15. Makia we luru nwunye n'etiti Hupim na n'etiti Shupim, aha nwa-nne-ya nwayi bu kwa Meaka;) aha nwa nke-abua bu kwa Zelọfehad: ma Zelọfehad nwere umu-ndinyom.
16. Meaka, bú nwunye Makia, we mua nwa-nwoke, o we kpọ aha-ya Peresh; aha nwa-nne-ya nwoke bu Sheresh; umu-ya ndikom bu Ulam na Rakem.
17. Umu-ndikom Ulam kwa; Bedan. Ndia bu umu Gilead, nwa Makia, nwa Manase.
18. Nwa-nne-ya nwayi, bú Hamoleket, we mua Ishhod, na Abieza, na Mahla.
19. Umu-ndikom Shemida bu kwa Ahian, na Shekem, na Likhi, na Aniam.
20. Umu-ndikom Efraim kwa; Shutela, na Bered nwa-ya, na Tahat nwa-ya, na Eleada nwa-ya, na Tahat nwa-ya,
21. na Zabad nwa-ya, na Shutela nwa-ya, na Eza, na Elead, ndi ndikom Gat, ndi amuru n'ala, b͕uru, n'ihi na ha ridatara ichiri anu-ulo-ha.
22. Efraim, bú nna-ha, we rue újú ọtutu ubọchi, umu-nne-ya we bia ikasi ya obi.
23. O we bakuru nwunye-ya, o we turu ime, mua nwa-nwoke, nna-ya we kpọ aha-ya Beria, n'ihi na ulo-ya di n'ọnọdu ọjọ.