63. Enyere umu Merari, dika ab͕uru nile ha si di, site n'ebo Reuben, site kwa n'ebo Gad, site kwa n'ebo Zebulun, obodo iri na abua n'ife-nzà.
64. Umu Israel we nye ndi Livai obodo ndia na ebe-ita-nri-ha.
65. Ha we nye obodo ndia, nke ha kpọrọ aha, site n'ebo umu Juda, site kwa n'ebo umu Simeon, site kwa n'ebo umu Benjamin, n'ife-nzà.
66. Ma ufọdu nime ab͕uru umu Kohat nwere obodo ókè-ala nile ha site n'ebo Efraim.
67. Ha nyere ha obodo nb͕abà, bú Shekem na ebe-ita-nri-ya nile n'ugwu Efraim; Gezea kwa na ebe-ita-nri-ya nile;
68. na Jọkmeam na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-horon na ebe-ita-nri-ya nile;
69. na Ajalon na ebe-ita-nri-ya nile, na Gat-rimon na ebe-ita-nri-ya nile:
70. site kwa na nkera ebo Manase; Anea na ebe-ita-nri-ya nile, na Bileam na ebe-ita-nri-ya nile ka enyere umu Kohat fọduru.
71. Enyere umu Giashom, site n'ab͕uru nkera ebo Manase, Golan nime Beshan na ebe-ita-nri-ya nile, na Ashtarot na ebe-ita-nri-ya nile:
72. site kwa n'ebo Isaka; Kedesh na ebe-ita-nri-ya nile, na Daberat na ebe-ita-nri-ya nile;