62. Enye-kwa-ra umu Giashom, dika ab͕uru nile ha si di, site n'ebo Isaka, site kwa n'ebo Asha, site kwa n'ebo Naftali, site kwa n'ebo Manase nime Beshan, obodo iri na atọ.
63. Enyere umu Merari, dika ab͕uru nile ha si di, site n'ebo Reuben, site kwa n'ebo Gad, site kwa n'ebo Zebulun, obodo iri na abua n'ife-nzà.
64. Umu Israel we nye ndi Livai obodo ndia na ebe-ita-nri-ha.
65. Ha we nye obodo ndia, nke ha kpọrọ aha, site n'ebo umu Juda, site kwa n'ebo umu Simeon, site kwa n'ebo umu Benjamin, n'ife-nzà.
66. Ma ufọdu nime ab͕uru umu Kohat nwere obodo ókè-ala nile ha site n'ebo Efraim.
67. Ha nyere ha obodo nb͕abà, bú Shekem na ebe-ita-nri-ya nile n'ugwu Efraim; Gezea kwa na ebe-ita-nri-ya nile;
68. na Jọkmeam na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-horon na ebe-ita-nri-ya nile;
69. na Ajalon na ebe-ita-nri-ya nile, na Gat-rimon na ebe-ita-nri-ya nile:
70. site kwa na nkera ebo Manase; Anea na ebe-ita-nri-ya nile, na Bileam na ebe-ita-nri-ya nile ka enyere umu Kohat fọduru.
71. Enyere umu Giashom, site n'ab͕uru nkera ebo Manase, Golan nime Beshan na ebe-ita-nri-ya nile, na Ashtarot na ebe-ita-nri-ya nile:
72. site kwa n'ebo Isaka; Kedesh na ebe-ita-nri-ya nile, na Daberat na ebe-ita-nri-ya nile;
73. na Remot na ebe-ita-nri-ya nile, na Anem na ebe-ita-nri-ya nile:
74. site kwa n'ebo Asha; Mashal na ebe-ita-nri-ya nile, na Abdon na ebe-ita-nri-ya nile;
75. na Hukok na ebe-ita-nri-ya nile, na Rehob na ebe-ita-nri-ya nile:
76. site kwa n'ebo Naftali; Kedesh nime Galili na ebe-ita-nri-ya nile, na Hamon na ebe-ita-nri-ya nile, na Kiriataim na ebe-ita-nri-ya nile.
77. Enyere umu Merari, bú ndi fọduru nime ndi Livai, site n'ebo Zebulun, Rimono na ebe-ita-nri-ya nile, na Teboa na ebe-ita-nri-ya nile:
78. enye-kwa-ra ha n'ofè Jọdan n'akuku Jeriko, n'akuku ọwuwa-anyanwu Jọdan, site n'ebo Reuben, Beza n'ọzara na ebe-ita-nri-ya nile, na Jahza na ebe-ita-nri-ya nile,