1. Ihe Emere 6:60-62 Bible Nso (IGBOB)

60. site kwa n'ebo Benjamin; Geba na ebe-ita-nri-ya nile, na Alemet na ebe-ita-nri-ya nile, na Anatot na ebe-ita-nri-ya nile. Obodo-ha nile bu obodo iri na atọ n'ab͕uru-ha nile.

61. Enye-kwa-ra umu Kohat, bú ndi fọduru, nime ab͕uru ebo ahu, nime nkera ebo ahu, bú nkera ebo Manase, obodo iri n'ife-nzà.

62. Enye-kwa-ra umu Giashom, dika ab͕uru nile ha si di, site n'ebo Isaka, site kwa n'ebo Asha, site kwa n'ebo Naftali, site kwa n'ebo Manase nime Beshan, obodo iri na atọ.

1. Ihe Emere 6