30. Shimea nwa-ya, Hagia nwa-ya, Asaia nwa-ya.
31. Ndia bu kwa ndi Devid guzoro dika ndi-isi akuku abua nke ndi-ọbù-abù nke ulo Jehova, site na mb͕e ib͕e Chineke zuru ike.
32. Ha we nēje ozi n'iru ebe-obibi ulo-ikwū nzute n'abù, rue mb͕e Solomon wuru ulo Jehova nime Jerusalem: ha we guzo n'ibu ndi-isi òfùfè-ha dika ikpe ekpere ha si di.
33. Ndia bu kwa ndi nēguzo, ha na umu-ha ndikom. Nime umu-ndikom ndi Kohat: Himan ọbù-abù, nwa Joel, nwa Samuel;
34. nwa Elkena, nwa Jeroham, nwa Eliel, nwa Toa;
35. nwa Zuf, nwa Elkena, nwa Mahat, nwa Amasai;
36. nwa Elkena, nwa Joel, nwa Azaraia, nwa Zefanaia;