6. Beera nwa-ya, onye Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, mere ka ọ je biri n'ala ọzọ: onye ahu bu onye-isi ndi Reuben nwere.
7. Na umu-nne-ya ndikom dika ab͕uru nile ha si di, mb͕e edere akwukwọ-osuso-ọmumu nke osuso-ọmumu nile ha; onye-isi, bú Jeiel, na Zekaraia,
8. na Bela nwa Azaz, nwa Shema, nwa Joel, onye ahu bi n'Aroea, we rue Nebo na Beal-meon:
9. ma n'ọwuwa-anyanwu o biruru nbata ọzara, bú site n'osimiri Yufretis: n'ihi na anu-ulo-ha bara uba n'ala Gilead.
10. Ma n'ubọchi Sọl ha busoro ndi Haga agha, ndi dara n'aka-ha: ha we biri n'ulo-ikwū-ha n'elu ala nile nke ọwuwa-anyanwu Gilead.
11. Umu Gad biri kwa na ncherita-iru ha, n'ala Beshan rue Saleka:
12. Joel, bú onye-isi, na Shafam, bú nke-abua, na Janai, na Shefat nime Beshan:
13. na umu-nne-ha ndikom nke ulo nke ndi bu nna-ha; Maikael, na Meshulam, na Sheba, na Jorai, na Jakan, na Zia, na Iba, asa.
14. Ndia bu umu-ndikom Abihail nwa Huri, nwa Jaroa, nwa Gilead, nwa Maikael, nwa Jeshishai, nwa Jahdo, nwa Buz;
15. Ahi nwa Abdiel, nwa Guni, bú onye-isi ulo nke ndi bu nna-ha.