1. Ihe Emere 5:6-11 Bible Nso (IGBOB)

6. Beera nwa-ya, onye Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, mere ka ọ je biri n'ala ọzọ: onye ahu bu onye-isi ndi Reuben nwere.

7. Na umu-nne-ya ndikom dika ab͕uru nile ha si di, mb͕e edere akwukwọ-osuso-ọmumu nke osuso-ọmumu nile ha; onye-isi, bú Jeiel, na Zekaraia,

8. na Bela nwa Azaz, nwa Shema, nwa Joel, onye ahu bi n'Aroea, we rue Nebo na Beal-meon:

9. ma n'ọwuwa-anyanwu o biruru nbata ọzara, bú site n'osimiri Yufretis: n'ihi na anu-ulo-ha bara uba n'ala Gilead.

10. Ma n'ubọchi Sọl ha busoro ndi Haga agha, ndi dara n'aka-ha: ha we biri n'ulo-ikwū-ha n'elu ala nile nke ọwuwa-anyanwu Gilead.

11. Umu Gad biri kwa na ncherita-iru ha, n'ala Beshan rue Saleka:

1. Ihe Emere 5