4. na Penuel nna Gedoa, na Iza nna Husha. Ndia bu umu-ndikom Hua, bú ọkpara Efrata, nna Bet-lehem.
5. Ma Ashua nna Tekoa nwere ndinyom abua, bú Hela na Naara.
6. Naara we muara ya Ahuzam, na Hifa, na Timeni, na Haahashtari. Ndia bu umu-ndikom Naara.
7. Umu-ndikom Hela bu kwa Zeret, na Zoha, na Etnan.
8. Koz we mua Anub, na Zobiba, na ab͕uru nile nke Ahahel nwa Harum.
9. Ma asọpuru Jebez kari umu-nne-ya ndikom: ma nne-ya kpọrọ aha-ya Jebez, si, N'ihi na amurum ya n'ihe-nb͕u.