36. na Elioenai, na Jaakoba, na Jeshohaia, na Asaia, na Adiel, na Jesimiel, na Benaia;
37. na Ziza nwa Shifi, nwa Alon, nwa Jedaia, nwa Shimri, nwa Shemaia;
38. Ndia ndi baworo n'akwukwọ n'aha bu ndi-isi n'ab͕uru-ha: ulo nke ndi bu nna-ha we basa rue ọtutu.
39. Ha we jerue nbata Gedoa, rue n'akuku ọwuwa-anyanwu ndagwurugwu, ichọ ihe iji zù ìgwè ewu na aturu-ha.