1. Ihe Emere 4:35-40 Bible Nso (IGBOB)

35. na Joel, na Jihu nwa Joshibia, nwa Seraia, nwa Asiel;

36. na Elioenai, na Jaakoba, na Jeshohaia, na Asaia, na Adiel, na Jesimiel, na Benaia;

37. na Ziza nwa Shifi, nwa Alon, nwa Jedaia, nwa Shimri, nwa Shemaia;

38. Ndia ndi baworo n'akwukwọ n'aha bu ndi-isi n'ab͕uru-ha: ulo nke ndi bu nna-ha we basa rue ọtutu.

39. Ha we jerue nbata Gedoa, rue n'akuku ọwuwa-anyanwu ndagwurugwu, ichọ ihe iji zù ìgwè ewu na aturu-ha.

40. Ha we chọta ihe-ọzùzù mara abuba di kwa nma, ala ahu sa-kwa-ra mbara n'akuku-ya abua, nādi kwa jū, nwe kwa udo; n'ihi na ndi bi n'ebe ahu na mb͕e gara aga sitere na Ham.

1. Ihe Emere 4