1. Ihe Emere 4:27-32 Bible Nso (IGBOB)

27. Shimai nwe-kwa-ra umu-ndikom iri na isi, na umu-ndinyom isi; ma umu-nne-ya ndikom enweghi ọtutu umu-ndikom, ab͕uru-ha nile abaghi kwa uba, ra ka umu Juda.

28. Ha we biri na Bia-sheba, na Molada, na Haza-shual;

29. na nime Bilha, na n'Ezem, na nime Tolad;

30. na nime Betuel, na nime Họma, na nime Ziklag;

31. na nime Bet-makabot, na nime Haza-susim, na nime Bet-biri, na nime Shaaraim. Ndia bu obodo-ha rue mb͕e Devid bu eze.

32. Obodo ntà ha bu Itam, na Ain, na Rimon, na Token, na Ashan, obodo ise:

1. Ihe Emere 4