26. Umu-ndikom Mishma kwa; Hamuel nwa-ya, Zakua nwa-ya, Shimai nwa-ya.
27. Shimai nwe-kwa-ra umu-ndikom iri na isi, na umu-ndinyom isi; ma umu-nne-ya ndikom enweghi ọtutu umu-ndikom, ab͕uru-ha nile abaghi kwa uba, ra ka umu Juda.
28. Ha we biri na Bia-sheba, na Molada, na Haza-shual;
29. na nime Bilha, na n'Ezem, na nime Tolad;
30. na nime Betuel, na nime Họma, na nime Ziklag;
31. na nime Bet-makabot, na nime Haza-susim, na nime Bet-biri, na nime Shaaraim. Ndia bu obodo-ha rue mb͕e Devid bu eze.
32. Obodo ntà ha bu Itam, na Ain, na Rimon, na Token, na Ashan, obodo ise: