21. Umu-ndikom Shila nwa Juda; Ia nna Lika, na Laada nna Marisha, na ab͕uru nile nke ulo ndi nākpa ezi ákwà ọcha, nke ulo Ashbia;
22. na Jokim, na ndikom Koziba, na Joash, na Saraf, bú ndi-nwe Moab, na Jashubi-lehem. Ma ihe ndia bu ihe ochie.
23. Ndi ahu bu ndi-ọkpu-ite, na ndi bi na Netaim na Gedira; ọ bu n'aka eze n'ije-ozi-ya ka ha biri n'ebe ahu.