11. Kelub nwa-nne Shua we mua Mehia, onye ahu bu nna Eshton.
12. Eshton we mua Bet-rafa, na Pasea, na Tehina, bú nna Ia-nehash. Ndia bu ndikom Rika.
13. Umu-ndikom Kenaz kwa; Ọtniel, na Seraia: umu-ndikom Ọtniel kwa; Hatat.
14. Meonotai we mua Ọfra: Seraia mu-kwa-ra Joab, bú nna Gi-harashim: n'ihi na ndi-ọ̀kà ka ha bu.
15. Umu-ndikom Keleb nwa Jefune kwa; Iru, na Ila, na Naam: umu-ndikom Ila kwa; na Kenaz.
16. Umu-ndikom Jehalelel kwa; Zif, na Zifa, na Tiria, na Asarel.
17. Umu-ndikom Ezra kwa; Jeta, na Mered, na Ifa, na Jalon: o we mua Miriam, na Shamai, na Ishba, bú nna Eshtemoa.