4. Umu isi ka amuru nye ya nime Hebron; o we buru eze n'ebe ahu arọ asa na ọnwa isi: orú arọ na iri na atọ ka ọ bu eze na Jerusalem.
5. Ma ndia ka amuru nye ya nime Jerusalem: Shimea, na Shobab, na Netan, na Solomon, anọ, bú nke Bat-shua nwa-nwayi Amiel:
6. na Ibha, na Elishama, na Elifelet;
7. na Noga, na Nefeg, na Jafia;
8. na Elishama, na Eliada, na Elifelet, iteghete.
9. Ndia nile bu umu-ndikom Devid, nāgughi umu-ndikom ndi-iko-ya ndinyom; Tema bu nwa-nne-ha nwayi.
10. Nwa Solomon bu Rehoboam, Abaija nwa-ya, Esa nwa-ya, Jehoshafat nwa-ya;