1. Ihe Emere 29:6-13 Bible Nso (IGBOB)

6. Ndi-isi ulo nke ndi bu nna, na ndi isi ebo Israel nile, na ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na nke usu nile nke ọgu ndikom ise, ọbuná rue ndi-isi ije-ozi eze, we were afọ-ofufo nye onwe-ha.

7. Ha we nye iji fè òfùfè ulo Chineke ọla-edo nnù talent iri-na-abua na ọgu iri, na orú nnù darie na nnù ise, na ọla-ọcha orú nnù talent na nnù ise, na ọla orú nnù uzọ abua na nnù ise, na ígwè orú nnù talent uzọ iri-na-abua na nnù iri.

8. Ndi achọtara nkume di oké ọnu-ahia n'aka-ha we nye ha itiye n'ulo-àkù nke ulo Jehova, n'aka Jehiel onye Giashon.

9. Ndi Israel we ṅuria ọṅu, n'ihi na ha were afọ-ofufo nye onwe-ha, n'ihi na n'obi zuru okè ka ha were afọ-ofufo nye Jehova onwe-ha: ọzọ kwa, Devid, bú eze, ṅuriri ọṅu uku.

10. Devid we gọzie Jehova n'anya nkpọkọta ahu nile: Devid we si, Onye agọziri agọzi ka I bu, Jehova, bú Chineke Israel nna-ayi, site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi.

11. Jehova, Gi nwe idi-uku, na idi-ike, na ima-nma, na nmeri, na ebube: n'ihi na ihe nile di n'elu-igwe na n'uwa bu nke Gi; Jehova, Gi nwe ala-eze, Gi bu kwa Onye anēweli elu iburu ihe nile onye-isi.

12. Ma àkù ma nsọpuru nēsite n'ebe I nọ bia, Gi onwe-gi nāchi kwa ihe nile; ọ bu kwa n'aka-Gi ka ume na idi-ike di; n'aka-Gi ka ọ di kwa ime uku, na ime ka ihe nile di ike.

13. Ma ub͕u a, Chineke-ayi, ayi onwe-ayi nēkele Gi, nēto kwa aha-Gi mara nma.

1. Ihe Emere 29