9. Ife-nzà mbu nke putara Esaf mara Josef: nke-abua mara Gedalia; ya onwe-ya na umu-nne-ya na umu-ya ndikom di iri na abua:
10. nke-atọ mara Zakua, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
11. nke anọ mara Izri, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
12. nke-ise mara Netanaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
13. nke-isi mara Bukia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
14. nke-asa mara Jesharela, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: