1. Ihe Emere 23:13-17 Bible Nso (IGBOB)

13. Umu-ndikom Amram; Eron na Moses: ewe kewapu Eron, ido ya nsọ ibu onye nsọ kachasi ndi nsọ nile, ya onwe-ya na umu-ya ndikom, rue mb͕e ebighi-ebi, isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova, ijere Ya ozi, na igọzi n'aha-Ya, rue mb͕e ebighi-ebi.

14. Ma Moses, bú onye nke Chineke ahu, anākpọ umu-ya ndikom aha n'etiti ebo Livai.

15. Umu-ndikom Moses; Giashom, na Elieza.

16. Umu-ndikom Giashon; Shebuel, bú onye-isi.

17. Umu-ndikom Elieza bu kwa Rehabia, bú onye-isi. Ma Elieza enweghi umu-ndikom ọzọ; ma umu-ndikom Rehabia bara uba nke-uku.

1. Ihe Emere 23